Isaiah 38

Ọrịa Hezekaya rịara

1Nʼoge ahụ, Hezekaya rịara ọrịa ruo na ọ gaara anwụ. Aịzaya onye amụma, nwa Emọz, bịakwutere ya, sị ya, “Otu a ka Onyenwe anyị sịrị: Dozie ezinaụlọ gị, nʼihi na ị ga-anwụ. Ị gaghị esite nʼute ọrịa a bilie.”

2Hezekaya tụgharịrị chee ihu ya nʼaja ụlọ kpee ekpere nye Onyenwe anyị sị, 3“Chetakwa, Onyenwe anyị, otu m si jegharịa nʼihu gị nʼikwesị ntụkwasị obi, jiri obi m niile fee gị ofufe, ma meekwa ihe dị mma nʼanya gị.” Hezekaya bekwara akwa nke ukwuu.

4Mgbe ahụ, okwu nke Onyenwe anyị rutere Aịzaya, 5“Gaa, gwa Hezekaya, sị ‘Otu a ka Onyenwe anyị, bụ Chineke nna gị Devid kwuru, anụla m ekpere gị, ahụkwala m anya mmiri akwa gị. Aga m atụkwasị afọ iri na ise nʼụbọchị ndụ gị. 6Aga m anapụtakwa gị na obodo a site nʼaka eze Asịrịa. Aga m echebe obodo a.

7“ ‘Nke a bụ ihe ịrịbama site nʼaka Onyenwe anyị nye gị, na Onyenwe anyị ga-emezu ihe a nke o kwere na nkwa. 8Aga m eme ka anyanwụ laa azụ nzọ ụkwụ iri nʼihe nrigo ụlọ elu Ehaz.’ ” Ya mere, anyanwụ laghachiri azụ nzọ ụkwụ iri.

9Ederede Hezekaya eze Juda, mgbe ọrịachara ọrịa, nwee ahụ ike:

10Asịrị m, “Ọ bụ nʼoge m bụ okorobịa
ka m ga-agabiga nʼọnụ ụzọ nke ọnwụ,
bụrụ onye anapụrụ oge ndụ m nke fọdụrụ afọdụ?”
11Asịrị m, “Ọ dịkwaghị mgbe m ga-ahụ Onyenwe anyị ọzọ
nʼala ndị dị ndụ,
m gaghị elegidekwa mmadụ ibe m anya ọzọ,
maọbụ bie nʼetiti ndị bi nʼime ụwa a.
12Esila nʼọnọdụ ya bupụ ụlọ m
dịka ụlọ ikwu nke onye ọzụzụ atụrụ.
Apịakọtala m ndụ m dịka ọkpa akwa si apịakọta akwa
o bipụla ndụ site nkwe-akwa,
ehihie na nʼabalị, ị mere ka ndụ m gwụsịa.
13Enwere m ntachiobi chere chi ọbụbọ.
Ma dịka ọdụm ka ọ na-agbaji ọkpụkpụ m niile.
Ehihie na nʼabalị ka ị na-eme ka ndụ m gwụsịa.
14Dịka eleke maọbụ ụgbala ka m na-ebe akwa.
Ana m asụ ude dịka nduru na-eru ụjụ.
Ike gwụrụ anya m nʼihi ile anya nʼeluigwe.
Anọ m nʼọnọdụ mkpagbu, Onyenwe anyị, bịa nyere m aka.”

15Ma gịnị ka m ga-ekwu?
Ya onwe ya gwara m sị na ọ bụ ya mere nke a.
M ga-eji obi umeala gagharịa ụbọchị ndụ m niile
nʼihi ihe mwute nke obi m.
16Onyenwe anyị, ọ bụ nʼihi ihe ndị a ka mmadụ ji adị ndụ.
Mmụọ m na-adịkwa ndụ nʼime ha.
I nyeghachila m ahụ ike,
mee ka m dị ndụ.
17Nʼezie, ọ bụ nʼihi ọdịmma m,
ka m ji taa ahụhụ nke ihe mgbu dị otu a.
Nʼịhụnanya gị ka ị zọpụtara m
site nʼolulu nke ịla nʼiyi.
I werela mmehie m niile
wefee nʼazụ gị.
18Nʼihi nʼala mmụọ agaghị eto gị,
ọnwụ agakwaghị abụku gị abụ otuto.
Ndị na-arịda nʼolulu
agaghị ele anya ikwesi ntụkwasị obi gị.
19Ọ bụ ndị dị ndụ, e, naanị ndị dị ndụ ga-eto gị otuto,
dị ka m na-eme taa.
Ọ bụ otu ọgbọ na-eme ka ọgbọ na-eso ha
mata ihe banyere ikwesi ntụkwasị obi gị.

20 Onyenwe anyị ga-azọpụta m,
anyị ga-abụ abụ kpọọ ụbọ akwara
nʼụbọchị niile nke ndụ anyị,
nʼime ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.
21Aịzaya ekwuolarị sị, “Kwadoonụ mmanụ fiig dị ọkụ tee ya nʼelu etuto ahụ, ahụ ga-adịkwa ya mma.”

22Hezekaya jụrụ sị, “Gịnị ga-abụ ihe ịrịbama na m ga-aga nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị?”

Copyright information for IboBIU